Kedu ihe bụ ọrịa shuga?
Usoro nri ji agbaze na atughari nri anyi na eri ka glucose (shuga).
Glucose bụ mmanụ na enye ike ka ahụ ruọ ọrụ nke ọma otu okwesiri. Ọbụrụ na ahụ enweghi insulini zuru oke ma ọbụ enweghi insulini cha cha, ọ na ebute suga ịgbakọ n'ime ahụ, nke na ebute ọrịa shuga na ọrịa mberede di iche iche.

Insulin bụ homonụ na emepụta na pancreas. Isi ọrụ ya bụ ime ka glucose dị n'ọbara dị maka cell anụ ahụ nile.
Onweghi ihere dina ọrịa shuga. Iga ebikwa ogologo ndu na ahu ike site na ime ihe dọkịta gi gwara gi, na eri nri kwesiri ekwesi, na agbati ahụ gi na kwa igba insulini ma ọ bụ mkpụrụ ọgwụ ọrịa shuga.
Ọrịa suga nke abuọ (Type 2 diabetes).

Ọrịa suga mbu (Type 1 diabetes).
Ọrịa shuga mbu na abia na afọ ọbụla ma ọbụ na onye ibu ma ọbụ onye tara ahụ. Na ọrịa shuga mbu ahụ anaghị emepụta insulin. Ndị nwere ọrịa a ga-achọ insulin ogologo ndụ ha nile. Ihe mgbaàmà ya na ebido na ntabi anya.

Ọrịa shuga nkea karichara. Ahụ anaghi eme insulini zuru ezu ma ọbụ ahụ enweghi ike imiri insulini otu okwesịrị.
Ona ebido ma mmadu gbafee iri ano, ana ahukwa ya na umu ntakiri (ụmụaka).
Mgbaàmà ya na ete aka tupu obido ana eleghakwara ya anya (elefukwara).
Afọ iri ano karia (igba karia afọ iri anọ).
Oke ibu.
Ịno ofu ebe ma ọbụ inọ ukpọrọ).
Ọrịa shuga inọ na abụrụ.
Ọrịa shuga mgbe nwanyi di ime na oge gara aga.
Ọbara mgbali elu.
Ihe na ebute ọrịa shuga nke abuọ.
Ụmụ nwanyị karịrị afọ iri atọ si na abụrụ na aria ọrịa shuga nwere ohere kachasị ịrịa ọrịa shuga mgbe ha di ime.
Ọrịa shuga mgbe nwanyi di ime (gestational diabetes).
Ọrịa a n'eme ụfọdụ umu nwanyi mgbe ha di ime. Ọna eme na onwa isii ma ọbụ asaa nke afọ ime. Ụfọdụ ụmụ nwanyi ndia na aria ọrịa shuga nke abuo ma emesia na ndu ha.
Ndị inyom nile dị ime kwesịrị ịlele shuga ọbara ha.

Ọbụrụ na ịna aria ọria shuga, jụa dọkịta gi HbA1c gi na ọnwa atọ ọbụla. Ebumnuche HbA1c gi bụ ịdị ntakịrị karịa 7% (53 mmol/mol).
Mgbaàmà nke ọrịa shuga.
Biko hụ dọkịta gị ka ọ lelee shuga ọbara ma ọ bụrụ na ị nwere nke ọbụla n'ime mgbaàmà ndị a.

Hemoglobin A1c bụ ihe nlele ọbara nke na egosi shuga nọ na ime ọbara na ọnwa atọ. Mgbe shuga nọ na ime ọbara kariri akari, mkpụrụ shuga kariri akari na atapara na mkpụrụ ọbara. Nkea na eme ka HbA1c gbagọọ elu.
Nchọpụta ọrịa shuga.
Shuga kwesiri ịno nime ọbara:
Shuga nọ na ọbara mgbe ana eri beghi nri diri ala karia 5.5 mml/L (100 mg/dl).
Shuga nọ na ọbara diri ntakiri karia 7.8 mml/L (140 mg/dl).