top of page

Ka anyị mụọ banyere ọbara mgbali elu.

Panel%202_edited.jpg

Nkọwa ọnụ ọgụgụ nọ na igwe eji ele ọbara mgbali elu. 

  1. Ọnụ ọgụgụ nke nọ na elu bu ọbara nọ na mgba aja akwara mgbe obi na akụ kpum-kpum. Ọnụ ọgụgụa kariri nke nọ na ala.

  2. Ọnụ ọgụgụ nke nọ na ala bu ọbara nọ na mgba aja akwara nọ na etiti obi na akụ kpum-kpum.

  3. Ọnụ ọgụgụ nke elu nke onye na enweghi ọbara mgbali elu agaghi efe narị iri abua ma ọ bụ pekarịa. Ọzọkwa, nke nọ na ala ga abụ ọgụ anọ ma ọ bụ pekarịa.

  4. Ọbara mgbali elu bu na ọnụ ọgụgụ nke elu di narị iri atọ ma ọ bụ karia. Ọzọkwa, nke nọ na ala ga abụ ọgụ anọ ma ọ bụ karia.

Mee ngwa ngwa hụ dọkịta gị ka o lelee ma gwọọ ọbara mgbali elu.

Panel%201_edited.jpg
  1. Nọdụ ala na oche ọfuma, zọde ụkwụ gị n’ala.  

  2. Gbanye mgbanaka igwe eji ele ọbara mgbali elu na aka nri ma ọ bụ aka ikpa gi.

  3. Me-e ka mgbanaka igwe eji ele ọbara mgbali elu nọrọ nke ọma na aka gi.

  4. Gbanye igwe eji ele ọbara mgbali elu.

Usoro eji ele ọbara mgbali elu gị

Ihe ndi a na-egbochi ga ebute ọbara mgbali elu.

Biko nuọ nu ọgwu unu otu okwesiri, na  ahukwanu dọkịta unu site na oge rue na oge. Jua nụ dọkịta unu tupu unu ebido ọgwụ ọhụrụ.

Ihe abụrụ na ebute ọbara mgbali elu.

Panel 5.jpg

Ihe egwu dị na ọbara mgbali elu.

Ọbara mgbali elu n’ebibi ihe nile di na ime ahụ. Ọkachasi:

Ụbụrụ: Mbam mmụọ bụ ofu n’ime ọria ọbara mgbali elu ana agwọghi agwọ na ebute.

Anya: Ọ na ebute ahụchaghi ụzọ na ikpu isi.

Obi: Obi mgbawa ba obi nkolopu na ebute ọnwu ike.

Akụrụ: Ọrịa akụrụ.

Ahụ akwụ ọtọ ụmụ nwoke.

Akwara: Akwara mkpọchi.

Ihe nsogbu ndia na adakwasi ndi na aria ọria suga na ọbara mgbali elu.

Glucometer-vector.png
bottom of page